The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Daniel 2

Daniel 2:47

Onye eze gwakwara Daniel, “Nʼezie, Chineke gị bụ Chineke kachasị chi niile. Ọ bụ ya na-achị eze niile bi nʼụwa, bụrụkwa Onye na-ekpughepụ ihe omimi niile, nʼihi na lee, i nwere ike ịkọwa ihe omimi nke a.”

Daniel 2:47 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Daniel 2Next →

Daniel 2:47 in other translations

KJV King James Version

The king answered unto Daniel, and said, Of a truth it is, that your God is a God of gods, and a Lord of kings, and a revealer of secrets, seeing thou couldest reveal this secret.

BSB Berean Standard Bible

The king said to Daniel, “Your God is truly the God of gods and Lord of kings, the Revealer of Mysteries, since you were able to reveal this mystery.”

WEB World English Bible

The king answered to Daniel, and said, “Of a truth your God is the God of gods, and the Lord of kings, and a revealer of secrets, since you have been able to reveal this secret.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

44 “Nʼoge ahụ, ndị eze ndị a ga-anọ nʼọchịchị, Chineke nke eluigwe ga-eme ka alaeze ọzọ bido. Ọ bụkwa alaeze nke a na-apụghị imebi emebi. O nwekwaghị onye ọbụla pụrụ imeri alaeze ahụ. Ọ ga-ala alaeze ndị ọzọ nʼiyi, mee ka ha bụrụ ihe efu, ma ọ ga-adịrị na-aga nʼihu ruo ebighị ebi.

45 Dịka i siri hụ nkume ahụ dị ukwuu e sitere nʼugwu wapụta, nke a na-ejighị aka wapụta were kụrichaa igwe ahụ, bronz ahụ, ụrọ ahụ, ọlaọcha ahụ na ọlaedo ahụ. “Chineke dị ukwuu emeela ka eze mara ihe na-aga ime nʼoge dị nʼihu. Nrọ a bụ eziokwu, nkọwa ya kwesikwara ntụkwasị obi.”

46 Mgbe ahụ, eze Nebukadneza dara nʼala nʼihu Daniel nye ya nsọpụrụ. O nyekwara iwu ka eweta onyinye na ụda na-esi isi ụtọ were chụnyere ya aja.

47 Onye eze gwakwara Daniel, “Nʼezie, Chineke gị bụ Chineke kachasị chi niile. Ọ bụ ya na-achị eze niile bi nʼụwa, bụrụkwa Onye na-ekpughepụ ihe omimi niile, nʼihi na lee, i nwere ike ịkọwa ihe omimi nke a.”

48 Emesịa eze nyere Daniel ọkwa dị ukwuu, nyekwa ya ọtụtụ onyinye dị iche iche. O mere ya onyeisi na-achị ala Babilọn niile, meekwa ya onyeisi ndị ndụmọdụ eze niile.

49 Ma dịka Daniel siri rịọ eze, o mekwara ka Shedrak, Mishak na Abednego bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn, Daniel nʼonwe ya nọdụrụ nʼogige eze.

Read Daniel 2 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV