The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Daniel 2
Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya.
Daniel 2:20 · Baịbụlụ Nsọ
Daniel answered and said, Blessed be the name of God for ever and ever: for wisdom and might are his:
and declared: “Blessed be the name of God forever and ever, for wisdom and power belong to Him.
Daniel answered, “Blessed be the name of God forever and ever; for wisdom and might are his.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
17 Emesịa, Daniel lara nʼụlọ nke ya gaa kọọrọ Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ndị enyi ya ihe merenụ.
18 Ọ gwara ha ka ha rịọọ maka ebere site nʼaka Chineke nke eluigwe banyere ihe nzuzo a, ka a hapụ igbu ya na ndị enyi ya na ndị amamihe fọdụrụ na Babilọn.
19 Nʼabalị, e mere ka Daniel mata ihe omimi ahụ site nʼọhụ. Mgbe ahụ, Daniel toro Chineke nke eluigwe,
20 Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya.
21 Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche; Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha. Ọ na-enye onye maara ihe amamihe, ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma.
22 Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo; Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị, ma ìhè binyekwara ya.
23 Ana m ekele gị, na-etokwa gị, Chineke nke nna m ha, nʼihi na i nyela m amamihe na ike. I meela ka m mata ihe anyị rịọrọ gị, i mekwala ka anyị mata nrọ ahụ eze rọrọ.”
Read Daniel 2 in the app The whole chapter