The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Daniel 10
eleliri m anya m elu, hụ nʼihu m otu nwoke yi uwe akwa ọcha, onye e kekwasịrị belịt e ji ọlaedo sitere Ụfaz mee nʼukwu ya.
Daniel 10:5 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Daniel 10Next →
Then I lifted up mine eyes, and looked, and behold a certain man clothed in linen, whose loins were girded with fine gold of Uphaz:
I lifted up my eyes, and behold, there was a certain man dressed in linen, with a belt of fine gold from Uphaz around his waist.
I lifted up my eyes and looked, and behold, there was a man clothed in linen, whose waist was adorned with pure gold of Uphaz.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
2 Nʼoge ahụ, mụ onwe m, bụ Daniel, ruru ụjụ izu ụka atọ.
3 Erighị m nri ọma ọbụla, erikwaghị m anụ, aṅụkwaghị m mmanya, eteghị m mmanụ otite ọbụla nʼahụ m nʼime izu ụka atọ a niile.
4 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ, eguzo m nʼakụkụ osimiri ukwu ahụ, bụ Taịgris,
5 eleliri m anya m elu, hụ nʼihu m otu nwoke yi uwe akwa ọcha, onye e kekwasịrị belịt e ji ọlaedo sitere Ụfaz mee nʼukwu ya.
6 Ahụ ya na-egbukwa maramara dịka nkume beril, ìhè si nʼihu ya dị ka ìhè nke amụma eluigwe. Mkpụrụ anya ya na-enwukwa dịka ire ọkụ. Ụkwụ ya na aka ya na-acha dịka bronz e hichara nke ọma. Okwu si ya nʼọnụ na-ada ụda dịka ụzụ nke ọtụtụ mmadụ.
7 Ọ bụ naanị m Daniel hụrụ ọhụ a. Ndị mụ na ha nọ ahụghị ya, kama na mberede, e mere ka oke egwu tụọ ha, nke mere ka ha gbara ọsọ gaa zoo onwe ha.
8 Ọ bụkwa naanị m nọ, mgbe m hụrụ oke ọhụ a. Mgbe m hụkwara ya, ike niile dị m nʼahụ si m nʼahụ pụọ. Ihu m gbanwere nke ukwuu, ike afọdụkwaghị m nʼahụ.
Read Daniel 10 in the app The whole chapter