The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Daniel 1
Ma Daniel kpebiri nʼobi ya na ọ gaghị emerụ onwe ya site nʼiri nri maọbụ ịṅụ mmanya eze. Ya mere ọ rịọrọ onyeisi ndị ozi ka ọ hapụ ya ka ọ ghara imerụ onwe ya.
Daniel 1:8 · Baịbụlụ Nsọ
But Daniel purposed in his heart that he would not defile himself with the portion of the king's meat, nor with the wine which he drank: therefore he requested of the prince of the eunuchs that he might not defile himself.
But Daniel made up his mind that he would not defile himself with the king’s food or wine. So he asked the chief official for permission not to defile himself.
But Daniel purposed in his heart that he would not defile himself with the king’s delicacies, nor with the wine which he drank. Therefore he requested of the prince of the eunuchs that he might not defile himself.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
5 Onye eze si nʼoche nri ya na-ewepụta nri na mmanya a ga-enye ha kwa ụbọchị. Ha ga-anọ nʼọzụzụ a afọ atọ, nke ọ ga-abụ e mechaa, ha ga-abụ ndị kwesiri ịnọ nʼije ozi nʼobi onye eze.
6 Ndị so nʼime ha bụ Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ha bụ ndị Juda.
7 Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego.
8 Ma Daniel kpebiri nʼobi ya na ọ gaghị emerụ onwe ya site nʼiri nri maọbụ ịṅụ mmanya eze. Ya mere ọ rịọrọ onyeisi ndị ozi ka ọ hapụ ya ka ọ ghara imerụ onwe ya.
9 Ma Chineke mere ka Daniel nweta ihuọma na obi ebere nʼaka onyeisi ndị na-ejere eze ozi. O nwekwara ọmịiko nʼebe Daniel nọ nʼihi ọnọdụ ha.
10 Ma onyeozi a gwara Daniel, “Ana m atụ egwu nʼihi onyenwe m eze, onye kwuru ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Ọ bụrụ na ọ hụ na unu tara ahụ karịa ndị ọgbọ unu ndị ọzọ, ndụ m ga-anọ na nsogbu nʼaka onye eze.”
11 Daniel sịrị onyeisi ahụ e tinyere ọrụ ilekọta Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya nʼaka,
Read Daniel 1 in the app The whole chapter