The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Daniel 1
Ya mere onyeisi ozi ahụ wepụrụ nri na mmanya ọma ahụ ha kwesiri iri ma nye ha naanị akwụkwọ nri.
Daniel 1:16 · Baịbụlụ Nsọ
Thus Melzar took away the portion of their meat, and the wine that they should drink; and gave them pulse.
So the steward continued to withhold their choice food and the wine they were to drink, and he gave them vegetables instead.
So the steward took away their delicacies and the wine that they were given to drink, and gave them vegetables.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
13 Jirizie anya gị chọpụta ma o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ndị ọzọ, ndị na-eri nri ọma nke eze nyere, site nʼihe ị hụrụ, mee ụmụodibo gị otu o kwesiri.”
14 O kwenyere ime ihe ha kwuru, ọ nwalere ha abalị iri.
15 Mgbe ụbọchị iri ahụ zuru, a chọpụtara na ahụ dị ha mma, chọpụtakwa na ha dị mma ile anya karịa ụmụ okorobịa ndị ọzọ e ji nri ọma niile eze nyere zụọ.
16 Ya mere onyeisi ozi ahụ wepụrụ nri na mmanya ọma ahụ ha kwesiri iri ma nye ha naanị akwụkwọ nri.
17 Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile.
18 Mgbe oge eze nyere a ga-eji kpọbata ha nʼije ozi ya zuru, onyeisi ndị na-eje ozi chere ha nʼihu Nebukadneza.
19 Ha na eze kparịtakwara ụka. Ma nʼime ụmụ okorobịa ahụ niile a zụrụ, o nweghị nke amamihe ya juru eze afọ dịka amamihe Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya. Nʼihi nke a, o mere ka ha soro bụrụ ndị na-adụ ya ọdụ.
Read Daniel 1 in the app The whole chapter