The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Amos 9
Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile, na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa. Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, ma na-awụsa ha nʼala, aha ya bụ Onyenwe anyị.
Amos 9:6 · Baịbụlụ Nsọ
It is he that buildeth his stories in the heaven, and hath founded his troop in the earth; he that calleth for the waters of the sea, and poureth them out upon the face of the earth: The LORD is his name.
He builds His upper rooms in the heavens and founds His vault upon the earth. He summons the waters of the sea and pours them over the face of the earth. The LORD is His name.
It is he who builds his rooms in the heavens, and has founded his vault on the earth; he who calls for the waters of the sea, and pours them out on the surface of the earth—the LORD is his name.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
3 Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamel nʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha, a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri, nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha.
4 Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ, nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha. “Aga m elekwasị ha anya m abụọ nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”
5 Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee, ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ; ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl, nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt.
6 Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile, na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa. Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, ma na-awụsa ha nʼala, aha ya bụ Onyenwe anyị.
7 “Ọ bụ na unu ndị Izrel adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel, site na Kafto kpọpụta ndị Filistia, ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia?
8 “Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie. Aghaghị m ịla ya nʼiyi, kpochapụ ya site nʼelu ụwa, naanị na m agaghị ebibicha ụlọ Jekọb kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
9 “Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu, aga m ayọgharị ụlọ Izrel nʼetiti mba niile dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ, ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala.
Read Amos 9 in the app The whole chapter