The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Amos 8
“Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “Aga m eme ka anyanwụ daa nʼetiti ehihie, ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị.
Amos 8:9 · Baịbụlụ Nsọ
And it shall come to pass in that day, saith the Lord GOD, that I will cause the sun to go down at noon, and I will darken the earth in the clear day:
And in that day, declares the Lord GOD, I will make the sun go down at noon, and I will darken the earth in the daytime.
It will happen in that day,” says the Lord GOD, “that I will cause the sun to go down at noon, and I will darken the earth in the clear day.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
6 Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye, jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa, ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti.
7 Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.”
8 Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a, ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ? Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl, a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa dịka iyi Ijipt.
9 “Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “Aga m eme ka anyanwụ daa nʼetiti ehihie, ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị.
10 Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ; gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa. Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe, meekwa ka unu kpụchaa isi unu. Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ. Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu.
11 “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala, ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị.
12 Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ, sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ; ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị, ma ha agaghị achọta ya.
Read Amos 8 in the app The whole chapter