The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Amos 2

Amos 2:8

Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla, nʼelu uwe ndị anatara na mbe. Nʼime ụlọnsọ chi ha, ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.

Amos 2:8 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Amos 2Next →

Amos 2:8 in other translations

KJV King James Version

And they lay themselves down upon clothes laid to pledge by every altar, and they drink the wine of the condemned in the house of their god.

BSB Berean Standard Bible

They lie down beside every altar on garments taken in pledge. And in the house of their God, they drink wine obtained through fines.

WEB World English Bible

They lay themselves down beside every altar on clothes taken in pledge. In the house of their God they drink the wine of those who have been fined.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

5 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda, ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”

6 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Izrel, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha, reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.

7 Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị, na-echi ha ọnụ nʼaja, na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe. Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ, si otu a merụọ aha nsọ m.

8 Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla, nʼelu uwe ndị anatara na mbe. Nʼime ụlọnsọ chi ha, ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.

9 “Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha, ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida, ndị sikwara ike dịka osisi ook. Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu, na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi.

10 Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu, duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ, ime ka unu nweta ala ndị Amọrait.

11 “Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma, họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait. Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya.

Read Amos 2 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV