The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Amos 2

Amos 2:2

Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab, nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt. Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara, nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.

Amos 2:2 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Amos 2Next →

Amos 2:2 in other translations

KJV King James Version

But I will send a fire upon Moab, and it shall devour the palaces of Kerioth: and Moab shall die with tumult, with shouting, and with the sound of the trumpet:

BSB Berean Standard Bible

So I will send fire against Moab to consume the citadels of Kerioth. Moab will die in tumult, amid war cries and the sound of the ram’s horn.

WEB World English Bible

but I will send a fire on Moab, and it will devour the palaces of Kerioth; and Moab will die with tumult, with shouting, and with the sound of the trumpet;

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Moab, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ, mee ha ka ha ghọọ ntụ.

2 Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab, nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt. Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara, nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.

3 Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi, gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.” Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.

4 Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Juda, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị. Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya. Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie, bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.

5 Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda, ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”

Read Amos 2 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV