The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 8

Acts 8:5

Filip gara nʼotu obodo dị na Sameria kwusaara ndị nọ nʼebe ahụ ihe banyere Kraịst.

Acts 8:5 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Acts 8Next →

Acts 8:5 in other translations

KJV King James Version

Then Philip went down to the city of Samaria, and preached Christ unto them.

BSB Berean Standard Bible

Philip went down to a city in Samaria and proclaimed the Christ to them.

WEB World English Bible

Philip went down to the city of Samaria and proclaimed to them the Christ.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

2 Ndị ikom, ndị na-atụ egwu Chineke, bịara buru ozu Stivin gaa lie ya. Ha ruru ụjụ nke ukwuu nʼihi ya.

3 Ma Sọl bidoro ịla nzukọ nʼiyi. Ọ na-abanye site nʼụlọ ga nʼụlọ ndị kwere ekwe na-adọpụta ha, nwoke na nwanyị, tinye ha nʼụlọ mkpọrọ.

4 Ndị ahụ a chụsasịrị zisara oziọma nʼebe niile ha gbagara.

5 Filip gara nʼotu obodo dị na Sameria kwusaara ndị nọ nʼebe ahụ ihe banyere Kraịst.

6 Igwe mmadụ gere ntị nʼihe Filip na-ekwu nʼihi na ha hụrụ ọrụ ịrịbama ọ rụrụ.

7 Mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha ji iti mkpu site nʼime ọtụtụ mmadụ pụta. Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwụrọ.

8 Nʼihi ya, ọṅụ dị ukwuu jupụtara nʼobodo ahụ.

Read Acts 8 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV