The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 7

Acts 7:41

Ha kpụụrụ onwe ha arụsị nke oyiyi nwa ehi, ha butere ihe ịchụ aja nye ya. Ha ṅụrịrị ọṅụ nʼọrụ nke aka ha.

Acts 7:41 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Acts 7Next →

Acts 7:41 in other translations

KJV King James Version

And they made a calf in those days, and offered sacrifice unto the idol, and rejoiced in the works of their own hands.

BSB Berean Standard Bible

At that time they made a calf and offered a sacrifice to the idol, rejoicing in the works of their hands.

WEB World English Bible

They made a calf in those days, and brought a sacrifice to the idol, and rejoiced in the works of their hands.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

38 Ya onwe ya nọ nʼọgbakọ nʼọzara, ya na mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu nʼUgwu Saịnaị, na nna nna anyị ha; ebe ọ natakwara okwu dị ndụ inye anyị.

39 “Ma nna nna anyị ha jụrụ irubere ya isi. Kama ha nupuru ya nʼakụkụ, ma tụgharịa laghachi azụ nʼIjipt nʼobi ha,

40 na-asị Erọn, ‘Meere anyị chi, ndị nke ga-edu anyị, nʼihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosis, onye sitere nʼala Ijipt dupụta anyị.’

41 Ha kpụụrụ onwe ha arụsị nke oyiyi nwa ehi, ha butere ihe ịchụ aja nye ya. Ha ṅụrịrị ọṅụ nʼọrụ nke aka ha.

42 Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe. Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma, “ ‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja unu chụụrụ m iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara?

43 Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk na kpakpando nke chi unu bụ Refan, bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha. Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’

44 “Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis.

Read Acts 7 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV