The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 3

Acts 3:5

O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye.

Acts 3:5 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Acts 3Next →

Acts 3:5 in other translations

KJV King James Version

And he gave heed unto them, expecting to receive something of them.

BSB Berean Standard Bible

So the man gave them his attention, expecting to receive something from them.

WEB World English Bible

He listened to them, expecting to receive something from them.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

2 Ma otu nwoke dara ngwụrọ site nʼafọ nne ya ka a na-ebute nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọnsọ ukwu ahụ ụbọchị niile ka ọ na-arịọ ndị na-aba nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ arịrịọ. Aha ọnụ ụzọ ama ahụ bụ ọnụ ụzọ ama ọma.

3 Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ.

4 Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.”

5 O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye.

6 Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.”

7 O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike.

8 Ọ wụliri elu nʼụkwụ ya, bido ịga ije. O soro ha baa nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ya na-aga, ya ana-awụlị elu, na-etokwa Chineke.

Read Acts 3 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV