The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 27
Mgbe o kwuchara nke a, o weere achịcha nye Chineke ekele nʼihu ha niile, nyawaa ya, malitekwa iri ya.
Acts 27:35 · Baịbụlụ Nsọ
And when he had thus spoken, he took bread, and gave thanks to God in presence of them all: and when he had broken it, he began to eat.
After he had said this, Paul took bread and gave thanks to God in front of them all. Then he broke it and began to eat.
When he had said this and had taken bread, he gave thanks to God in the presence of all; then he broke it and began to eat.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
32 Nʼihi nke a, ndị agha ahụ gbubiri ụdọ e jiri kee ụgbọ epeepe ahụ hapụ ụgbọ epeepe ahụ ka ọ daba nʼime osimiri.
33 Mgbe chi bidoro ịbọ, Pọl rịọrọ mmadụ niile ka ha rie nri, na-asị, “Taa mere ya ụbọchị iri na anọ unu nọ na nche, nọgidekwa nʼibu ọnụ, nʼerighị ihe ọbụla.
34 Nʼihi ọdịmma nke ndụ unu, ana m arịọ unu ka unu rie ihe. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu otu agịrị isi ya ga-ala nʼiyi.”
35 Mgbe o kwuchara nke a, o weere achịcha nye Chineke ekele nʼihu ha niile, nyawaa ya, malitekwa iri ya.
36 Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ niile nʼobi, ha bidokwara iri nri.
37 Anyị niile nọ nʼụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii.
38 Mgbe anyị richara nri, ha buuru akpa ọka niile dị nʼụgbọ ahụ tụba ha nʼime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa mfe.
Read Acts 27 in the app The whole chapter