The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 27
Mgbe ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha wedatara ụgbọ epeepe e dobere maka ihe mberede, mee dịka ha na-aga itinye arịlịka nʼọnụ ụgbọ mmiri ahụ.
Acts 27:30 · Baịbụlụ Nsọ
And as the shipmen were about to flee out of the ship, when they had let down the boat into the sea, under colour as though they would have cast anchors out of the foreship,
Meanwhile, the sailors attempted to escape from the ship. Pretending to lower anchors from the bow, they let the lifeboat down into the sea.
As the sailors were trying to flee out of the ship and had lowered the boat into the sea, pretending that they would lay out anchors from the bow,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
27 Ihe dịka nʼetiti abalị nʼụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nʼosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso.
28 Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nʼọnụ ya nʼime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nʼebe ahụ ha nọ. Ha gakwara nʼihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ itoolu.
29 Ma egwu juru ha obi nʼihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara arịlịka anọ e ji ejide ụgbọ site nʼazụ ụgbọ ahụ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ.
30 Mgbe ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha wedatara ụgbọ epeepe e dobere maka ihe mberede, mee dịka ha na-aga itinye arịlịka nʼọnụ ụgbọ mmiri ahụ.
31 Ma Pọl gwara ndị agha na ọchịagha ha okwu, “Ọ bụrụ na ndị a anọgideghị nʼime ụgbọ a, agaghị azọpụta unu.”
32 Nʼihi nke a, ndị agha ahụ gbubiri ụdọ e jiri kee ụgbọ epeepe ahụ hapụ ụgbọ epeepe ahụ ka ọ daba nʼime osimiri.
33 Mgbe chi bidoro ịbọ, Pọl rịọrọ mmadụ niile ka ha rie nri, na-asị, “Taa mere ya ụbọchị iri na anọ unu nọ na nche, nọgidekwa nʼibu ọnụ, nʼerighị ihe ọbụla.
Read Acts 27 in the app The whole chapter