The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 27
Mgbe e kpebiri na anyị ga-eso ụgbọ mmiri gaa Itali, e nyefere Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nʼaka onyeisi na-elekọta ndị mkpọrọ aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha nke igwe ndị agha Ọgọstọs.
Acts 27:1 · Baịbụlụ Nsọ
And when it was determined that we should sail into Italy, they delivered Paul and certain other prisoners unto one named Julius, a centurion of Augustus' band.
When it was decided that we would sail for Italy, Paul and some other prisoners were handed over to a centurion named Julius, who belonged to the Imperial Regiment.
When it was determined that we should sail for Italy, they delivered Paul and certain other prisoners to a centurion named Julius, of the Augustan band.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mgbe e kpebiri na anyị ga-eso ụgbọ mmiri gaa Itali, e nyefere Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nʼaka onyeisi na-elekọta ndị mkpọrọ aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha nke igwe ndị agha Ọgọstọs.
2 Anyị banyere nʼụgbọ sitere Adramitiọm nke na-ejikere ịga nʼọnụ mmiri nke dị nʼakụkụ obodo Eshịa. Anyị nupuru nʼoke osimiri, Arịstakọs, onye Masidonia sitere na Tesalonaịka sokwa anyị nʼije a.
3 Nʼechi ya, anyị rutere Saịdọn. Juliọs nwere obiọma nʼebe Pọl nọ. Ọ hapụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ọbịa nke ọma.
4 Nʼịgakwa nʼihu na mmiri ahụ, anyị zutere ifufe mmiri nke mere na anyị gara nʼazụ ala Saiprọs.
Read Acts 27 in the app The whole chapter