The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 26
“Ndị Juu niile maara ibi ndụ m site na nwata m. Ha makwa site na mbụ, otu m si bie ndụ m niile nʼobodo nke m, nakwa nʼime Jerusalem.
Acts 26:4 · Baịbụlụ Nsọ
My manner of life from my youth, which was at the first among mine own nation at Jerusalem, know all the Jews;
Surely all the Jews know how I have lived from the earliest days of my youth, among my own people and in Jerusalem.
“Indeed, all the Jews know my way of life from my youth up, which was from the beginning among my own nation and at Jerusalem;
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Agripa gwara Pọl, “Ị nwere ike i kwuru ọnụ gị.” Mgbe ahụ, Pọl gbasara aka ya abụọ bido ikwu okwu ịgọrọ onwe ya,
2 “Ana m agụ onwe m dịka onye nwere ihuọma, eze Agripa, inwe ohere ọma dị otu a, ịzara ọnụ m nʼihu gị nʼihe niile metụtara ebubo ndị Juu na-ebo m.
3 Nke ka nke, amatara m na omenaala ndị Juu na ịrụ ụka metụtara iwu ha doro gị anya. Biko ana m arịọ gị ka i jiri ndidi gee m ntị.
4 “Ndị Juu niile maara ibi ndụ m site na nwata m. Ha makwa site na mbụ, otu m si bie ndụ m niile nʼobodo nke m, nakwa nʼime Jerusalem.
5 Ha matara kemgbe ogologo oge, ha ga-agbakwa ama, ma ọ bụrụ na ha chọrọ ikwu eziokwu, na site na mbụ e biri m ndụ dịka otu onye so nʼime otu ahụ nke iwu ya dị ike karịchasịa nʼime okpukpe ndị Juu, nke bụ otu ndị Farisii.
6 Ma ugbu a, a na-ekpe m ikpe nʼihi na enwere m olileanya na nkwa ahụ Chineke kwere nna nna anyị ochie ha.
7 Nkwa nke ebo iri na abụọ niile na-ele anya ịnata mgbe ha na-efe ofufe ehihie na abalị. Eze Agripa, ọ bụ nʼihi olileanya a, gị onye a na-asọpụrụ, ka ndị Juu ji na-ebo m ebubo.
Read Acts 26 in the app The whole chapter