The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 25
Mgbe ndị na-ebo ya ebubo biliri, ọ dịghị otu nʼime ụrụ ala ndị m chere ha ga-akpọ aha nke ha gụpụtara na o mere.
Acts 25:18 · Baịbụlụ Nsọ
Against whom when the accusers stood up, they brought none accusation of such things as I supposed:
But when his accusers rose to speak, they did not charge him with any of the crimes I had expected.
When the accusers stood up, they brought no charges against him of such things as I supposed;
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
15 Mgbe m gara Jerusalem, ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu gwara m banyere ya. Ha rịọkwara ka m maa ya ikpe.
16 “Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịrara mmadụ ọbụla nye tupu ekpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nʼihu ndị na-ebo ya ebubo.
17 Nʼihi nke a, mgbe ha bịara nʼebe a, atụfughị m oge ọbụla, kama nʼụbọchị nke ọzọ ya, anọdụrụ m nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọbata nwoke ahụ.
18 Mgbe ndị na-ebo ya ebubo biliri, ọ dịghị otu nʼime ụrụ ala ndị m chere ha ga-akpọ aha nke ha gụpụtara na o mere.
19 Okwu ha niile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ha, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusịkwa ike na ọ dị ndụ.
20 Ọ rara m ahụ imedo okwu dị otu a. Nʼihi ya, a jụrụ m ya ma ọ ga-amasị ya ị ga nʼụlọikpe dị na Jerusalem ka ọ nọrọ nʼebe ahụ gọrọ onwe ya.
21 Ma Pọl rịọrọ ka e debe ya nʼụlọ mkpọrọ ruo mgbe Siza nʼonwe ya ga-ekpebi ikpe ya. Ya mere, ezighachiri m ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo mgbe m jikeere izigara ya Siza.”
Read Acts 25 in the app The whole chapter