The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 20
“Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọbụla nʼime unu, bụ ndị m jegharịrị nʼetiti ha na-ezisara ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ.
Acts 20:25 · Baịbụlụ Nsọ
And now, behold, I know that ye all, among whom I have gone preaching the kingdom of God, shall see my face no more.
Now I know that none of you among whom I have preached the kingdom will see my face again.
“Now, behold, I know that you all, among whom I went about preaching God’s Kingdom, will see my face no more.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
22 “Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dịka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nʼebe ahụ.
23 Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-agbara m ama nʼebe ọbụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nʼebe ahụ.
24 Ma akpọghị m ndụ m ihe ọbụla. Karịa naanị ka m gbazuo ọsọ m ma jezuokwa ozi ahụ m natara nʼaka Onyenwe anyị Jisọs, nke bụ ịkọwa banyere oziọma nke amara Chineke.
25 “Ma ugbu a, amaara m na o nweghị onye ọbụla nʼime unu, bụ ndị m jegharịrị nʼetiti ha na-ezisara ihe banyere alaeze a ga-ahụ m anya ọzọ.
26 Ya mere, ana m agwasị unu ike, taa, na abụ m onye aka ya dị ọcha nʼebe ọbara onye ọbụla nʼime unu dị.
27 Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.
28 Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya.
Read Acts 20 in the app The whole chapter