The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 20

Acts 20:16

Nʼoge a, Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nʼEfesọs ka ọ ghara itufu oge nʼEshịa, nʼihi na ọ na-eme ngwangwa irute Jerusalem nʼụbọchị mmemme Pentikọọsụ, ma ọ bụrụ ihe ọ pụrụ ime.

Acts 20:16 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Acts 20Next →

Acts 20:16 in other translations

KJV King James Version

For Paul had determined to sail by Ephesus, because he would not spend the time in Asia: for he hasted, if it were possible for him, to be at Jerusalem the day of Pentecost.

BSB Berean Standard Bible

Paul had decided to sail past Ephesus to avoid spending time in the province of Asia, because he was in a hurry to reach Jerusalem, if possible, by the day of Pentecost.

WEB World English Bible

For Paul had determined to sail past Ephesus, that he might not have to spend time in Asia; for he was hastening, if it were possible for him, to be in Jerusalem on the day of Pentecost.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

13 Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ.

14 Mgbe o zutere anyị nʼAsọs, anyị buru ya nʼụgbọ gaa Mitilen.

15 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nʼụbọchị nke so ya, anyị gafere rute Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs.

16 Nʼoge a, Pọl kpebiri na ọ gaghị akwụsị nʼEfesọs ka ọ ghara itufu oge nʼEshịa, nʼihi na ọ na-eme ngwangwa irute Jerusalem nʼụbọchị mmemme Pentikọọsụ, ma ọ bụrụ ihe ọ pụrụ ime.

17 Site na Melitọs, ọ zipụrụ ozi ka a kpọọrọ ya ndị okenye chọọchị nke Efesọs ka ha bịa zute ya.

18 Oge ha bịakwutere ya, ọ gwara ha, “Unu maara nke ọma otu m si nọ nʼetiti unu mgbe niile mụ na unu nọrọ, site nʼụbọchị mbụ ụkwụ m zọkwasịrị nʼala Eshịa tutu ruo ugbu a.

19 Arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nʼobi umeala na anya mmiri nʼetiti ntaramahụhụ dị ukwuu, site nʼizu ọjọọ ndị Juu gbara maka m.

Read Acts 20 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV