The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 19

Acts 19:22

O zipụrụ ndị na-enyere ya aka, bụ Timoti na Erastọs ka ha buru ụzọ jeruo Masidonia. Ma ya onwe ya nọgidere nʼime Eshịa nwa oge.

Acts 19:22 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Acts 19Next →

Acts 19:22 in other translations

KJV King James Version

So he sent into Macedonia two of them that ministered unto him, Timotheus and Erastus; but he himself stayed in Asia for a season.

BSB Berean Standard Bible

He sent two of his helpers, Timothy and Erastus, to Macedonia, while he stayed for a time in the province of Asia.

WEB World English Bible

Having sent into Macedonia two of those who served him, Timothy and Erastus, he himself stayed in Asia for a while.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

19 Ọtụtụ nʼime ndị na-agwọ ọgwụ mgbaasị bupụtara akwụkwọ niile ha ji na-eme mgbaasị, kpọọ ha ọkụ nʼihu mmadụ niile. Akwụkwọ niile a kpọrọ ọkụ nʼụbọchị ahụ ga-eru ego ruru puku ọlaọcha iri ise.

20 Ya mere, okwu Onyenwe anyị toro, na-agbasa nʼike nʼike na-adịkwa ire.

21 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Pọl kpebiri nʼime mmụọ ya na ya ga-eje ruo Masidonia na Akaịa tupu ọ bịaruo Jerusalem. O sịkwara “na ya aghaghị ijeru Rom nʼọgwụgwụ ije ya niile.”

22 O zipụrụ ndị na-enyere ya aka, bụ Timoti na Erastọs ka ha buru ụzọ jeruo Masidonia. Ma ya onwe ya nọgidere nʼime Eshịa nwa oge.

23 Ma ọ bụ nʼoge a ka oke nsogbu malitere megide Ụzọ ahụ.

24 Otu onye ụzụ na-agbaze ọlaọcha, aha ya bụ Dimitriọs, onye ji ọlaọcha na-akpụ ụlọ arụsị ala ahụ a na-akpọ Atemis. Ọ na-ewetara ya na ndị ụzụ ibe ya ego nʼebe o hiri nne.

25 Nwoke a kpọkọtara ndị ọrụ ya niile, na ndị ya na ha na-arụkọ otu ọrụ, sị, “Ndị ibe m, unu ma na ọ bụ site nʼọrụ nke a ka anyị si enweta akụnụba anyị.

Read Acts 19 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV