The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 18
Nʼebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nʼobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwunye ya Prisila sitere Itali Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nʼobodo Rom. Pọl gara hụ ha,
Acts 18:2 · Baịbụlụ Nsọ
And found a certain Jew named Aquila, born in Pontus, lately come from Italy, with his wife Priscilla; (because that Claudius had commanded all Jews to depart from Rome:) and came unto them.
There he found a Jew named Aquila, a native of Pontus, who had recently come from Italy with his wife Priscilla because Claudius had ordered all the Jews to leave Rome. Paul went to visit them,
He found a certain Jew named Aquila, a man of Pontus by race, who had recently come from Italy with his wife Priscilla, because Claudius had commanded all the Jews to depart from Rome. He came to them,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Ka nke a mechara, Pọl hapụrụ Atens gaa Kọrint.
2 Nʼebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nʼobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwunye ya Prisila sitere Itali Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nʼobodo Rom. Pọl gara hụ ha,
3 nʼihi na ha na-arụ otu ọrụ, o binyere ha, sokwara ha rụkọọ ọrụ nʼihi na ha bụ ndị na-akpa akwa e ji ama ụlọ ikwu.
4 Ụbọchị izuike niile, ọ na-arụ ụka nʼụlọ nzukọ ha na-agbalị ime ka ndị Juu na ndị Griik kwere.
5 Mgbe Saịlas na Timoti sitere na Masidonia bịa, Pọl tinyere oge ya niile ikwusa okwu na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Kraịst ahụ.
Read Acts 18 in the app The whole chapter