The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 17
Ha hapụrụ Jesin na ndị ọzọ, naanị mgbe ndị akaebe bịara kwụọ ụgwọ e jiri gbapụta ha.
Acts 17:9 · Baịbụlụ Nsọ
And when they had taken security of Jason, and of the other, they let them go.
And they collected bond from Jason and the others, and then released them.
When they had taken security from Jason and the rest, they let them go.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
6 Ma mgbe ha na-achọtaghị ha nʼebe ahụ, ha dọpụtara Jesin na ụmụnna anyị ụfọdụ, duru ha jekwuru ndị ikpe nke obodo ahụ, na-eti mkpu, “Ndị a kpuru ụwa ihu nʼala abịala inye obodo ukwu anyị nsogbu.
7 Ma Jesin nabatara ha nʼụlọ ya. Ha na-emebi iwu Siza nʼihi na ha na-asịkwa na ọ dị eze ọzọ dị nke a na-akpọ Jisọs.”
8 Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nʼetiti ndị ikpe na mmadụ niile.
9 Ha hapụrụ Jesin na ndị ọzọ, naanị mgbe ndị akaebe bịara kwụọ ụgwọ e jiri gbapụta ha.
10 Ma nʼabalị ahụ, ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl na Saịlas ka ha gaa obodo Beria. Ma mgbe ha ruru nʼebe ahụ, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu.
11 Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu a karịa ndị bi na Tesalonaịka. Nʼihi na ha ji ịnụ ọkụ nʼobi nara okwu ahụ, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị, ka ha mara ma ihe ha na-ekwu ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị niile.
12 Ọtụtụ nʼime ha kweere, ụfọdụ ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke ndị Griik a maara aha ha chegharịkwara.
Read Acts 17 in the app The whole chapter