The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 16
Mgbe ha dutara ha nʼihu ndị na-ekpe ikpe ha sịrị, “Ndị ikom a bụ ndị Juu ma ha etinyela ọgbaaghara nʼobodo anyị,
Acts 16:20 · Baịbụlụ Nsọ
And brought them to the magistrates, saying, These men, being Jews, do exceedingly trouble our city,
They brought them to the magistrates and said, “These men are Jews and are throwing our city into turmoil
When they had brought them to the magistrates, they said, “These men, being Jews, are agitating our city
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
17 Ma o sogidere anyị na Pọl ebe ọbụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-asị, “Ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ha bịara ikwupụtara unu ihe banyere ụzọ nzọpụta.”
18 O mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nʼoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nʼime ya pụta!” Otu mgbe ahụ o siri nʼime ya pụta.
19 Mgbe ndị nwe ya hụrụ nʼolileanya ha iji inweta ego akwụsịla, ha jidere Pọl na Saịlas dọkpụrụ ha jekwuru ndịisi obodo nʼọma ahịa.
20 Mgbe ha dutara ha nʼihu ndị na-ekpe ikpe ha sịrị, “Ndị ikom a bụ ndị Juu ma ha etinyela ọgbaaghara nʼobodo anyị,
21 site nʼikuzi omenaala megidere iwu anyị, nke anyị bụ ndị Rom na-enweghị ike ịnabata maọbụ mee.”
22 Igwe mmadụ sonyere imegide ha. Ndị ikpe nyere iwu ka a dọwaa uwe, pịakwa ha ihe.
23 Mgbe ha pịachara ha ihe nke ọma, a tụnyere ha nʼime ụlọ mkpọrọ, nyekwa onye nche iwu ka o chee ha nke ọma.
Read Acts 16 in the app The whole chapter