The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 15
Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye zukọtara itule okwu a.
Acts 15:6 · Baịbụlụ Nsọ
And the apostles and elders came together for to consider of this matter.
So the apostles and elders met to look into this matter.
The apostles and the elders were gathered together to see about this matter.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
3 Nzukọ ahụ zipụrụ ha nʼụzọ ha, mgbe ha sitere Fonisia na Sameria na-agafe, ha kọrọ otu ndị mba ọzọ siri chegharịa. Nke a wetara ndị niile kwere ekwe oke ọṅụ dị ukwuu.
4 Mgbe ha bịaruru Jerusalem, nzukọ, ndị ozi na ndị okenye nabatara ha, ha kọkwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee.
5 Ma ụfọdụ ndị kwere ekwe si nʼotu ndị Farisii biliri na-ekwu sị, “Na ọ dị mkpa ka e bie ha ugwu ma gwakwa ha ka ha dobe iwu Mosis.”
6 Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye zukọtara itule okwu a.
7 Mgbe ha nọ tulegide okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu niile maara na site na mbụ Chineke họpụtara m site nʼetiti unu, ka m zisaa oziọma ahụ nye ndị mba ọzọ ka ha nụrụ, ma kwerekwa.
8 Chineke a, onye maara obi mmadụ niile gbaara ha akaebe site nʼinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dịka anyị si nata ya na mbụ.
9 O gosighị na o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ha. Nʼihi na o mere ka obi ha dị ọcha site nʼokwukwe.
Read Acts 15 in the app The whole chapter