The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 15

Acts 15:35

Pọl na Banabas nọgidere nʼAntiọk, ebe ha na ndị ọzọ kuziri ihe ma kwusakwa okwu Onyenwe anyị.

Acts 15:35 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Acts 15Next →

Acts 15:35 in other translations

KJV King James Version

Paul also and Barnabas continued in Antioch, teaching and preaching the word of the Lord, with many others also.

BSB Berean Standard Bible

But Paul and Barnabas remained at Antioch, along with many others, teaching and preaching the word of the Lord.

WEB World English Bible

But Paul and Barnabas stayed in Antioch, teaching and preaching the word of the Lord, with many others also.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

32 Judas na Saịlas, ndị ha onwe ha bụ ndị amụma, kwuru ọtụtụ okwu, iji gbaa ha ume na ime ka okwukwe ndị kwere ekwe guzosie ike.

33 Mgbe ha nọnyesịrị ha nwa oge nta, ndị kwere ekwe ji ngọzị nke udo zilaga ha ka ha laghachikwuru ndị zitere ha.

34 Ma ọ masịrị Saịlas ịnọtukwu nʼebe ahụ.

35 Pọl na Banabas nọgidere nʼAntiọk, ebe ha na ndị ọzọ kuziri ihe ma kwusakwa okwu Onyenwe anyị.

36 Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Pọl gwara Banabas, “Ka anyị gaghachi nʼobodo niile anyị kwusara okwu Onyenwe anyị nʼotu nʼotu, mata ka ndị kwere ekwe si agbalị nʼebe ahụ.”

37 Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa.

38 Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha.

Read Acts 15 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV