The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 1
Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị,
Acts 1:21 · Baịbụlụ Nsọ
Wherefore of these men which have companied with us all the time that the Lord Jesus went in and out among us,
Therefore it is necessary to choose one of the men who have accompanied us the whole time the Lord Jesus went in and out among us,
“Of the men therefore who have accompanied us all the time that the Lord Jesus went in and out among us,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Ego ọ natara nʼihi ọrụ ọjọọ ya ka o jiri zụọ ala. Nʼala ahụ ka ọ dara sụọ isi nʼala, afọ ya etipuo, eriri afọ ya awụsịakwa.
19 Ndị niile bi na Jerusalem nụrụ akụkọ banyere ya. Nʼihi ya, ha kpọrọ ala ahụ nʼasụsụ ha Akeldama, nke pụtara Ala Ọbara.
20 Pita sịrị, “Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ Abụ Ọma: “ ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya,’ na, “ ‘Ka onye ọzọ nọchiekwa ọnọdụ ya ka onyeisi.’
21 Ya mere, otu onye nʼime ndị anyị na ha nọ nʼoge niile Onyenwe anyị Jisọs nọ nʼetiti anyị,
22 bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.”
23 Ya mere, ha họpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas (aha ya ọzọ bụkwa Jọstus) na Mataias.
24 Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a.
Read Acts 1 in the app The whole chapter