The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Samuel 4

2 Samuel 4:2

Nʼoge a, nwa Sọl nwere mmadụ abụọ ndị bụ ndịisi ndị na-aga apụnara ndị mmadụ ihe. Aha otu onye bụ Baana, aha onye nke ọzọ bụ Rekab. Ha abụọ bụ ụmụ Rimọn onye Beerọt, nke dị nʼebo Benjamin. A na-agụ ndị Beerọt dịka ndị Benjamin,

2 Samuel 4:2 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Samuel 4Next →

2 Samuel 4:2 in other translations

KJV King James Version

And Saul's son had two men that were captains of bands: the name of the one was Baanah, and the name of the other Rechab, the sons of Rimmon a Beerothite, of the children of Benjamin: (for Beeroth also was reckoned to Benjamin:

BSB Berean Standard Bible

Saul’s son had two men who were leaders of raiding parties. One was named Baanah and the other Rechab; they were sons of Rimmon the Beerothite of the tribe of Benjamin—Beeroth is considered part of Benjamin,

WEB World English Bible

Saul’s son had two men who were captains of raiding bands. The name of one was Baanah and the name of the other Rechab, the sons of Rimmon the Beerothite, of the children of Benjamin (for Beeroth also is considered a part of Benjamin;

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Mgbe Ishboshet nwa Sọl nụrụ na Abna anwụọla na Hebrọn. Ọ tụrụ egwu. Ndị Izrel tụkwara egwu hie nne.

2 Nʼoge a, nwa Sọl nwere mmadụ abụọ ndị bụ ndịisi ndị na-aga apụnara ndị mmadụ ihe. Aha otu onye bụ Baana, aha onye nke ọzọ bụ Rekab. Ha abụọ bụ ụmụ Rimọn onye Beerọt, nke dị nʼebo Benjamin. A na-agụ ndị Beerọt dịka ndị Benjamin,

3 nʼihi na ndị Beerọt gbara ọsọ agha gbalaa Gitaim, obodo ndị Benjamin. Ha bikwa nʼebe ahụ ruo taa dịka ndị ọbịa.

4 (Jonatan nwa Sọl nwere otu nwa nwoke dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ. Ọ gbara afọ ise mgbe akụkọ banyere Sọl na Jonatan si Jezril bịarute ha. Nwanyị na-eku ya kuuru ya bido ịgbapụ ọsọ, ma dịka ọ na-agba ọsọ, nwantakịrị nwoke ahụ dara nʼala ghọọ onye ngwụrọ. Aha ya bụ Mefiboshet.)

5 Nʼoge a, Rekab na Baana ụmụ Rimọn, onye Beerọt bịaruru nʼụlọ Ishboshet nʼoge ehihie, mgbe ọ nọ na-ezu ike.

Read 2 Samuel 4 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV