The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Samuel 24

2 Samuel 24:21

Arauna sịrị, “Gịnị mere onyenwe m, bụ eze ji bịakwute ohu ya?” Devid zaghachiri, “Abịara m ịzụrụ ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja; ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ.”

2 Samuel 24:21 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Samuel 24Next →

2 Samuel 24:21 in other translations

KJV King James Version

And Araunah said, Wherefore is my lord the king come to his servant? And David said, To buy the threshingfloor of thee, to build an altar unto the LORD, that the plague may be stayed from the people.

BSB Berean Standard Bible

“Why has my lord the king come to his servant?” Araunah said. “To buy your threshing floor,” David replied, “that I may build an altar to the LORD, so that the plague upon the people may be halted.”

WEB World English Bible

Araunah said, “Why has my lord the king come to his servant?” David said, “To buy your threshing floor, to build an altar to the LORD, that the plague may be stopped from afflicting the people.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

18 Nʼụbọchị ahụ, Gad bịara nʼụlọ Devid gwa ya sị, “Gaa, wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.”

19 Ya mere, Devid rubere isi gaa mee dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼọnụ Gad.

20 Mgbe Arauna weliri anya hụ eze na ndị ọrụ ya ka ha na-abịa nʼebe ọ nọ, ọ pụtara kpọọ isiala nye eze. Kpudokwa ihu ya nʼala.

21 Arauna sịrị, “Gịnị mere onyenwe m, bụ eze ji bịakwute ohu ya?” Devid zaghachiri, “Abịara m ịzụrụ ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja; ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ.”

22 Arauna sịrị Devid, “Ka onyenwe m, bụ eze were ihe ọbụla ọ chọrọ, werekwa chụọ aja. Lee ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, leekwa ihe igwe ịzọcha ọka niile, na osisi ndị ahụ niile a na-anyanye ehi nʼolu, ka ha bụrụ nkụ.

23 Eze, ihe ndị a niile ka mụ bụ Arauna na-enye eze, ka Onyenwe anyị Chineke gị nabatakwa gị.”

24 Ma eze zaghachiri Arauna, “Ee, aghaghị m ịkwụzu gị ụgwụ ya, nʼihi na agaghị m achụrụ Onyenwe anyị, bụ Chineke m aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.” Ya mere, Devid zụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ na ehi ahụ niile, kwụọ Arauna iri shekel ọlaọcha ise, nʼihi ha.

Read 2 Samuel 24 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV