The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Samuel 14
Eze sịrị Joab, “Ọ dị mma, aga m eme ya. Gaa kpọghachite nwokorobịa ahụ bụ Absalọm.”
2 Samuel 14:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Samuel 14Next →
And the king said unto Joab, Behold now, I have done this thing: go therefore, bring the young man Absalom again.
Then the king said to Joab, “I hereby grant this request. Go, bring back the young man Absalom.”
The king said to Joab, “Behold now, I have granted this thing. Go therefore, and bring the young man Absalom back.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Mgbe ahụ, eze gwara nwanyị ahụ okwu sị, “Achọrọ m ka ị gwa m eziokwu nʼajụjụ a m na-aga ịjụ gị.” Nwanyị ahụ zara sị, “Ka onyenwe m, bụ eze kwuo ihe dị ya nʼobi.”
19 Devid jụrụ ya sị, “Aka Joab ọ dị nʼokwu ndị a niile?” Nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka ị na-adị ndụ, onyenwe m, bụ eze, ọ dịghị onye ọbụla ga-esi nʼihe onyenwe m bụ eze kwuru, chee ihu nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. E, ọ bụ ohu gị Joab nyere m iwu ime nke a, ya gwakwara ohu gị nwanyị okwu niile ndị a.
20 Ohu gị bụ Joab mere ihe a ka ọ gbanwee otu ọnọdụ ihe dị ugbu a. Onyenwe m nwere amamihe dịka ndị mmụọ ozi Chineke. Ọ maakwara ihe niile na-eme nʼala.”
21 Eze sịrị Joab, “Ọ dị mma, aga m eme ya. Gaa kpọghachite nwokorobịa ahụ bụ Absalọm.”
22 Joab dara nʼala kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala, gọzie eze. Joab sịrị, “Taa ka ohu gị maara na ahụtala m amara nʼihu gị, onyenwe m bụ eze, nʼihi na eze e merela ohu ya ihe ọ rịọrọ.”
23 Joab biliri gaa Geshua, kpọlata Absalọm na Jerusalem.
24 Mgbe ha bịaruru, eze gwara Joab okwu sị, “Gwa ya ka ọ laa nʼụlọ ya. Ọ gaghị abịa nʼihu m, nʼihi na-achọghị m ịhụ ya anya.” Ya mere, Absalọm lara nʼụlọ ya. Ọ hụkwaghị eze anya.
Read 2 Samuel 14 in the app The whole chapter