The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Samuel 13

2 Samuel 13:4

Otu ụbọchị, Jonadab bịakwutere Amnọn jụọ ya sị, “Gịnị mere, gị bụ nwa eze ji na-ata ahụ ụtụtụ niile? Ọ bụ na ị gaghị akọrọ m?” Amnọn gwara ya sị, “Ahụrụ m Tama nʼanya, bụ nwanne Absalọm, nwanne m nwoke.”

2 Samuel 13:4 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Samuel 13Next →

2 Samuel 13:4 in other translations

KJV King James Version

And he said unto him, Why art thou, being the king's son, lean from day to day? wilt thou not tell me? And Amnon said unto him, I love Tamar, my brother Absalom's sister.

BSB Berean Standard Bible

so he asked Amnon, “Why are you, the son of the king, so depressed morning after morning? Won’t you tell me?” Amnon replied, “I am in love with Tamar, my brother Absalom’s sister.”

WEB World English Bible

He said to him, “Why, son of the king, are you so sad from day to day? Won’t you tell me?” Amnon said to him, “I love Tamar, my brother Absalom’s sister.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Absalọm nwa Devid nwere otu nwanne nwanyị mara mma, aha ya bụ Tama. Ma Amnọn, otu nʼime ụmụ ndị ikom Devid, hụrụ nwaagbọghọ a nʼanya.

2 Ma ịhụnanya a Amnọn hụrụ Tama nwanne ya nwanyị mere ya ka ọ daa ọrịa, nʼihi na ọ bụ ihe rara Amnọn ahụ ịchọpụta ụzọ ya na Tama ga-esi nwee mmekọ, ebe ọ bụ na Tama bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.

3 Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid.

4 Otu ụbọchị, Jonadab bịakwutere Amnọn jụọ ya sị, “Gịnị mere, gị bụ nwa eze ji na-ata ahụ ụtụtụ niile? Ọ bụ na ị gaghị akọrọ m?” Amnọn gwara ya sị, “Ahụrụ m Tama nʼanya, bụ nwanne Absalọm, nwanne m nwoke.”

5 Jonadab gwara ya sị, “Ọ dị mma. Lee ihe ị ga-eme. Gaa dinaa ala, dịka a ga-asị na ahụ adịghị gị. Mgbe nna gị bịara ileta gị, gwa ya okwu sị ya, ‘Achọrọ m ka nwanne m nwanyị bụ Tama bịa nye m ihe oriri. Achọrọ m ka ọ nọdụ nʼihu m sie nri ahụ, mgbe m na-ele ya anya, ka o jirikwa aka ya nye m nri ahụ.’ ”

6 Amnọn mere otu a. Mgbe eze bịara ileta ya, Amnọn rịọrọ ya sị, “Biko, ka Tama bịa ebe a gheere m achịcha ole na ole ebe m ga-ahụ ya anya. Ka o jirikwa aka ya dozie ya nʼihu m ka m rie ya.”

7 Devid kwenyere, zie Tama ka ọ gaa nʼụlọ Amnọn gaa siere ya nri.

Read 2 Samuel 13 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV