The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Samuel 12

2 Samuel 12:13

Mgbe ahụ, Devid sịrị Netan, “Emehiela m megide Onyenwe anyị.” Netan zara sị ya, “Onyenwe anyị nʼonwe ya agbagharakwala gị mmehie gị, ị gaghị anwụ.

2 Samuel 12:13 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Samuel 12Next →

2 Samuel 12:13 in other translations

KJV King James Version

And David said unto Nathan, I have sinned against the LORD. And Nathan said unto David, The LORD also hath put away thy sin; thou shalt not die.

BSB Berean Standard Bible

Then David said to Nathan, “I have sinned against the LORD.” “The LORD has taken away your sin,” Nathan replied. “You will not die.

WEB World English Bible

David said to Nathan, “I have sinned against the LORD.” Nathan said to David, “The LORD also has put away your sin. You will not die.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

10 Ya mere, nʼihi ihe a i mere, mma agha agaghị esi nʼezinaụlọ gị pụọ, nʼihi na i ledara m anya kpọrọ nwunye Ụraya onye Het ka ọ bụrụ nwunye gị.’

11 “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ si nʼezinaụlọ gị bilie megide gị. Nʼihu gị ka m ga-eduru ndị nwunye gị dunye otu onye dị gị nnọọ nso, ya na ha ga-edinakọ nʼehihie ọcha, nʼihu ndị Izrel niile.

12 I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’ ”

13 Mgbe ahụ, Devid sịrị Netan, “Emehiela m megide Onyenwe anyị.” Netan zara sị ya, “Onyenwe anyị nʼonwe ya agbagharakwala gị mmehie gị, ị gaghị anwụ.

14 Ma nʼihi na i meela ka ndị iro Onyenwe anyị nwe ohere ikwulu na ilelị ya anya, nwa nwoke ahụ amụụrụ gị ga-anwụ.”

15 Mgbe Netan lara, Onyenwe anyị mere ka nwantakịrị ahụ nwunye Ụraya mụụrụ Devid daa ọrịa.

16 Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị.

Read 2 Samuel 12 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV