The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Peter 1
Anyị onwe anyị nụrụ olu ahụ si nʼeluigwe daa mgbe anyị so ya nọdụ nʼelu ugwu nsọ ahụ.
2 Peter 1:18 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Peter 1Next →
And this voice which came from heaven we heard, when we were with him in the holy mount.
And we ourselves heard this voice from heaven when we were with Him on the holy mountain.
We heard this voice come out of heaven when we were with him on the holy mountain.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
15 Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile.
16 Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya.
17 Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.”
18 Anyị onwe anyị nụrụ olu ahụ si nʼeluigwe daa mgbe anyị so ya nọdụ nʼelu ugwu nsọ ahụ.
19 Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu.
20 Nke ka nke, ghọtanụ na okwu amụma ọbụla dị nʼakwụkwọ nsọ abụghị nke e dere dịka akọnuche mmadụ si dị.
21 Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, ọ bụ Mmụọ Nsọ duru ha.
Read 2 Peter 1 in the app The whole chapter