The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Kings 6

2 Kings 6:21

Mgbe eze Izrel hụrụ ha, ọ jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Nna m, ị chọrọ ka m gbuo ha?”

2 Kings 6:21 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Kings 6Next →

2 Kings 6:21 in other translations

KJV King James Version

And the king of Israel said unto Elisha, when he saw them, My father, shall I smite them? shall I smite them?

BSB Berean Standard Bible

And when the king of Israel saw them, he asked Elisha, “My father, shall I kill them? Shall I kill them?”

WEB World English Bible

The king of Israel said to Elisha, when he saw them, “My father, shall I strike them? Shall I strike them?”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

18 Mgbe ndị iro ahụ na-abịaru ya nso, Ịlaisha kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Mee ka ìsì kpuo ndị agha niile.” O mekwara ka ìsì kpuo ha, dịka Ịlaisha rịọọrọ.

19 Ịlaisha pụtara sị ha, “Nke a abụghị ụzọ, nke a abụkwaghị obodo unu na-achọ. Soronụ m, ka m gosi unu nwoke unu na-achọ.” O duuru ha jee Sameria.

20 Mgbe ha bịaruru Sameria, Ịlaisha kpere ekpere sị, “Biko, Onyenwe anyị, ugbu a meghee anya ha, ka ha hụ ụzọ.” Onyenwe anyị meghere anya ha dịka Ịlaisha kpere nʼekpere; ha matakwara na ha nọ na Sameria.

21 Mgbe eze Izrel hụrụ ha, ọ jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Nna m, ị chọrọ ka m gbuo ha?”

22 Ịlaisha zara sị ya, “Egbula ha. Ị ga-egbu ndị i ji mma agha na ụta gị dọta nʼagha? Nye ha nri na mmiri, zilaga ha ka ha lakwuru onyenwe ha.”

23 Ya mere, ọ kwadooro ha oke oriri dị ukwuu, mgbe ha riri, ṅụkwaa, o zilagara ha, ha lakwuuru nna ha ukwu. Site nʼoge ahụ gaa nʼihu, ndị otu Aram na-apụnara mmadụ ihe kwusịrị inye nsogbu nʼoke ala ndị Izrel.

24 Ma mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ben-Hadad, eze Aram, chịkọtara ndị agha ya niile pụta bịa gbaa Sameria gburugburu.

Read 2 Kings 6 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV