The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Kings 21
Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel wagharịa ọzọ site nʼala ahụ nke m nyere ndị nna nna ha, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu ma debekwa iwu niile nke ohu m bụ Mosis nyere ha.”
2 Kings 21:8 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Kings 21Next →
Neither will I make the feet of Israel move any more out of the land which I gave their fathers; only if they will observe to do according to all that I have commanded them, and according to all the law that my servant Moses commanded them.
I will never again cause the feet of the Israelites to wander from the land that I gave to their fathers, if only they are careful to do all I have commanded them—the whole Law that My servant Moses commanded them.”
I will not cause the feet of Israel to wander any more out of the land which I gave their fathers, if only they will observe to do according to all that I have commanded them, and according to all the law that my servant Moses commanded them.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
5 O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe, nʼogige abụọ nke nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
6 O jikwa nwa ya nwoke chụọ aja nʼime ọkụ, ọ gbara aja, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.
7 O were chi Ashera a pịrị apị, bụ nke o mere, debe nʼime ụlọnsọ ahụ, nke Onyenwe anyị gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu, sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi.
8 Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel wagharịa ọzọ site nʼala ahụ nke m nyere ndị nna nna ha, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu ma debekwa iwu niile nke ohu m bụ Mosis nyere ha.”
9 Ma ha egeghị ntị, Manase duhiere ha, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel.
10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ ndị amụma ya, sị,
11 “Nʼihi na Manase, eze Juda emeela ihe arụ ndị a, o meela ihe dị njọ karịa nke ndị Amọrait, bụ ndị bụ ya ụzọ, o werela arụsị ya duba Juda nʼime mmehie.
Read 2 Kings 21 in the app The whole chapter