The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Kings 21
Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, sịrị: Lee, ana m aga iweta mbibi dị ukwuu nke ga-adakwasị Jerusalem na Juda, nke ntị ọbụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru.
2 Kings 21:12 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Kings 21Next →
Therefore thus saith the LORD God of Israel, Behold, I am bringing such evil upon Jerusalem and Judah, that whosoever heareth of it, both his ears shall tingle.
this is what the LORD, the God of Israel, says: ‘Behold, I am bringing such calamity upon Jerusalem and Judah that the news will reverberate in the ears of all who hear it.
therefore the LORD the God of Israel says, ‘Behold, I will bring such evil on Jerusalem and Judah that whoever hears of it, both his ears will tingle.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
9 Ma ha egeghị ntị, Manase duhiere ha, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel.
10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ ndị amụma ya, sị,
11 “Nʼihi na Manase, eze Juda emeela ihe arụ ndị a, o meela ihe dị njọ karịa nke ndị Amọrait, bụ ndị bụ ya ụzọ, o werela arụsị ya duba Juda nʼime mmehie.
12 Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, sịrị: Lee, ana m aga iweta mbibi dị ukwuu nke ga-adakwasị Jerusalem na Juda, nke ntị ọbụla nụrụ ya ga-azụ wuruwuru.
13 Aga m esetipụ eriri ịtụ ọtụtụ nke m ji megide Sameria na ihe ịtụ mgbidi nke m ji megide ụlọ Ehab, nʼelu Jerusalem. Aga m ehichapụ Jerusalem dịka mmadụ si ehichapụ efere, hichaa ya ihu na azụ ma kpuo ya ihu nʼala.
14 Aga m agbakụtakwa ndị fọdụrụ nʼihe nketa m azụ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha ga-aghọ ihe anaara nʼike, ghọọkwa ihe nkwata nʼagha nye ndị iro ha niile,
15 nʼihi na ha emeela ihe dị njọ nʼanya m, kpasukwaa m iwe, site nʼụbọchị nna nna ha si Ijipt pụta ọbụladị ruo taa.”
Read 2 Kings 21 in the app The whole chapter