The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Kings 13
Jehoash soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Jeroboam anọchie nʼocheeze ya. E liri Jehoash na Sameria, nʼebe e liri ndị eze Izrel ndị ibe ya.
2 Kings 13:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Kings 13Next →
And Joash slept with his fathers; and Jeroboam sat upon his throne: and Joash was buried in Samaria with the kings of Israel.
And Jehoash rested with his fathers, and Jeroboam succeeded him on the throne. Jehoash was buried in Samaria with the kings of Israel.
Joash slept with his fathers; and Jeroboam sat on his throne. Joash was buried in Samaria with the kings of Israel.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Nʼafọ iri atọ na asaa nke ịbụ eze Joash na Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ị bụ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị afọ iri na isii.
11 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, mmehie nke Jeroboam dubara Izrel ime. Jehoash nọgidere nʼime ha.
12 Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha o buru megide Amazaya eze Juda, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
13 Jehoash soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Jeroboam anọchie nʼocheeze ya. E liri Jehoash na Sameria, nʼebe e liri ndị eze Izrel ndị ibe ya.
14 Nʼoge a, Ịlaisha nọ nʼọrịa nke ọ ga-esite na ya anwụ. Jehoash, bụ eze Izrel gara ịhụ ya, ọ kwara akwa mgbe ọ hụrụ ya sị, “Nna m, nna m, usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!”
15 Ịlaisha gwara ya okwu sị, “Wepụta ụta na àkụ ụfọdụ.” O mere dịka Ịlaisha gwara ya.
16 Ịlaisha gwakwara eze Izrel okwu sị ya, “Jide ụta ahụ nʼaka gị abụọ.” Mgbe o jidere ụta ahụ Ịlaisha tụkwasịrị aka nke ya nʼaka eze.
Read 2 Kings 13 in the app The whole chapter