The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Corinthians 13
Ma anyị na-arịọ Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọọ ọbụla. Anyị anaghị eme nke a iji gosi na anyị kwesiri ekwesi, kama ka unu nwee ike mee ihe dị mma, nʼagbanyeghị na ọ ga-adị ka a ga-asị na anyị emeghị nke ọma nʼọrụ anyị.
2 Corinthians 13:7 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Corinthians 13Next →
Now I pray to God that ye do no evil; not that we should appear approved, but that ye should do that which is honest, though we be as reprobates.
Now we pray to God that you will not do anything wrong—not that we will appear to have stood the test, but that you will do what is right, even if we appear to have failed.
Now I pray to God that you do no evil; not that we may appear approved, but that you may do that which is honorable, though we may seem to have failed.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
4 Ọ bụ ezie na a kpọgidere ya na-adịghị ike, ma ugbu a, ọ na-adị ndụ site nʼike dị ukwuu nke Chineke. Anyị bụkwa ndị na-adịghị ike nʼime ya, ma ozi anyị na-ejere unu na mmekọrịta anyị na unu, anyị ga-eso ya dị ndụ site nʼike nke Chineke.
5 Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu nyochaa onwe ya, tulekwa omume ya, mara ma ọ ka kwudosiri ike nʼokwukwe ya. Ọ bụ na unu aghọtaghị na Jisọs Kraịst nọ nʼime unu? Ma ọ bụghị na unu enyochaala onwe unu hụ na unu emeghị nke ọma.
6 Enwere m olileanya na unu niile ga-achọpụta na anyị adaghị ule ahụ.
7 Ma anyị na-arịọ Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọọ ọbụla. Anyị anaghị eme nke a iji gosi na anyị kwesiri ekwesi, kama ka unu nwee ike mee ihe dị mma, nʼagbanyeghị na ọ ga-adị ka a ga-asị na anyị emeghị nke ọma nʼọrụ anyị.
8 Nʼihi na anyị apụghị ime ihe ọbụla megide eziokwu, kama anyị na-eme ihe niile nʼihi eziokwu.
9 Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe anyị na-adịghị ike ma hụ na unu dị ike. Ihe anyị na-arịọ Chineke bụ ka unu tozuo oke.
10 Ana m edere unu akwụkwọ a ugbu a, nʼihi na-achọghị m ịbara unu mba na inye unu ntaramahụhụ mgbe m bịara. Achọkwaghị m iji ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nye unu ntaramahụhụ, kama achọrọ m iji ya wulie unu elu dịka ụlọ.
Read 2 Corinthians 13 in the app The whole chapter