The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 9
Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.
2 Chronicles 9:19 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 9Next →
And twelve lions stood there on the one side and on the other upon the six steps. There was not the like made in any kingdom.
Twelve lions stood on the six steps, one at either end of each step. Nothing like this had ever been made for any kingdom.
Twelve lions stood there on the one side and on the other on the six steps. There was nothing like it made in any other kingdom.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
16 Ọ kpụkwara narị ọta nta atọ, nke sitere na ọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram atọ na ọkara ka eji kpụọ ọta ọbụla. Eze debere ha nʼụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn.
17 Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie
18 Ocheeze ahụ nwere ihe nrigo isii na ihe ịtụkwasị ụkwụ eji ọlaọcha rụọ nke ejikọtara nʼahụ ya. E nwere ebe ntụkwasị aka nʼakụkụ abụọ ya, nke nwere oyiyi ọdụm abụọ guzo nʼakụkụ nke ọbụla nʼime ha.
19 Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.
20 Ihe niile Solomọn nwere nke e ji aṅụ ihe bụ ọlaedo ka e ji mee ha. Ngwongwo niile nke dị nʼime ụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji kpụọ ha. Ọ dịghị ihe e ji ọlaọcha kpụọ, nʼihi na-agụnyeghị ọlaọcha dịka ihe ọbụla nʼoge Solomọn.
21 Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa nke ndị ohu Hiram na-elekọta. Otu ugbo nʼafọ atọ, ka ụgbọ ndị a na-alọta buru ọlaedo, ọlaọcha na ọdụ enyi, enwe na adaka dị iche iche bata.
22 Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nweekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa.
Read 2 Chronicles 9 in the app The whole chapter