The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 7

2 Chronicles 7:9

Nʼụbọchị nke asatọ, ha nwere ọgbakọ, nʼihi na ha mere mmemme nke ido ebe ịchụ aja nsọ nʼime ụbọchị asaa, meekwa mmemme ahụ abalị asaa ọzọ.

2 Chronicles 7:9 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Chronicles 7Next →

2 Chronicles 7:9 in other translations

KJV King James Version

And in the eighth day they made a solemn assembly: for they kept the dedication of the altar seven days, and the feast seven days.

BSB Berean Standard Bible

On the eighth day they held a solemn assembly, for the dedication of the altar had lasted seven days, and the feast seven days more.

WEB World English Bible

On the eighth day, they held a solemn assembly; for they kept the dedication of the altar seven days, and the feast seven days.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

6 Ndị nchụaja guzo nʼihu ọrụ ha, ha na ndị Livayị. Ha jiri ngwa egwu Onyenwe anyị nke eze Devid mere maka ị na-eto Onyenwe anyị, bụkwa nke o ji mgbe o nyere ekele, na-asị, “Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.” Na ncherita ihu ndị Livayị, ndị nchụaja fụrụ opi ike ha mgbe ndị Izrel guzooro ọtọ.

7 Mgbe ahụ, Solomọn doro etiti ogige dị nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ nsọ. Nʼebe ahụ ka ọ nọ chụọ aja nsure ọkụ, aja onyinye mkpụrụ ọka na aja abụba udo. O mere nke a nʼihi na ebe ịchụ aja bronz nke ọ rụrụ enweghị ike ịbata aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka niile nakwa aja abụba ndị ahụ.

8 Ya mere, Solomọn mere mmemme a nʼoge ahụ, ụbọchị asaa, ya na ndị Izrel niile. Ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt.

9 Nʼụbọchị nke asatọ, ha nwere ọgbakọ, nʼihi na ha mere mmemme nke ido ebe ịchụ aja nsọ nʼime ụbọchị asaa, meekwa mmemme ahụ abalị asaa ọzọ.

10 Ya mere, nʼụbọchị nke iri abụọ na atọ nʼọnwa nke asaa, o zilagara ndị ahụ niile nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị Devid na Solomọn na ndị ya Izrel.

11 Mgbe Solomọn rụchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze, mezukwaa ihe niile bụ nke o bu nʼobi ime nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nakwa nʼụlọeze nke ya onwe ya.

12 Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya nʼọhụ abalị sị ya, “Anụla m ekpere gị, ahọrọkwala m ebe a nye onwe m, ka ọ bụrụ ebe ịchụ aja.

Read 2 Chronicles 7 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV