The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 6
mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile (nʼihi na naanị gị maara obi ụmụ mmadụ),
2 Chronicles 6:30 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 6Next →
Then hear thou from heaven thy dwelling place, and forgive, and render unto every man according unto all his ways, whose heart thou knowest; (for thou only knowest the hearts of the children of men:)
be heard by You from heaven, Your dwelling place. And may You forgive and repay each man according to all his ways, since You know his heart—for You alone know the hearts of men—
then hear from heaven your dwelling place and forgive, and render to every man according to all his ways, whose heart you know (for you, even you only, know the hearts of the children of men),
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
27 biko, site nʼeluigwe nụrụ ma gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, ndị gị Izrel. Kuziere ha ezi ụzọ ha ga-esi bie ndụ ma zidata mmiri ozuzo nʼala ahụ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.
28 “Mgbe ụnwụ, maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe ga-adakwasị ala a, maọbụ ọrịa na-eripịa ihe ubi, maọbụ ọmụma ebu; maọbụ igurube, maọbụ ụkpana, maọbụ mgbe ndị iro ga-anọchibido ha nʼobodo ha niile, ihe mbibi niile maọbụ ọrịa ọbụla,
29 ekpere ọbụla maọbụ arịrịọ nke onye ọbụla nʼetiti ndị gị Izrel kpere ma rịọọ, nʼihi ịghọta ihe otiti na ihe mgbu niile, ha gbasapụ aka ha, ma chee ihu ha nʼebe ụlọnsọ ukwu dị;
30 mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile (nʼihi na naanị gị maara obi ụmụ mmadụ),
31 ka ha tụọ egwu gị, jeekwa ije nʼirubere gị isi nʼoge niile ha na-ebi nʼala ahụ nke i nyere nna nna anyị ha.
32 “Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị Izrel, kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi ukwu gị, nʼaka gị dị ike na ogwe aka gị e setipụrụ esetipụ. Mgbe ha bịara kpee ekpere nʼụlọnsọ a,
33 mgbe ahụ, site nʼeluigwe ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Mekwaa ihe niile nke onye mba ọzọ ahụ na-arịọ nʼekpere, ka ndị niile nke ụwa mara aha gị, tụọkwa egwu gị, dịka ndị nke gị bụ Izrel na-eme. Ka ha matakwa na-akpọkwasịrị Aha gị nʼụlọ a nke m wuru.
Read 2 Chronicles 6 in the app The whole chapter