The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 6
Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha.
2 Chronicles 6:3 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 6Next →
And the king turned his face, and blessed the whole congregation of Israel: and all the congregation of Israel stood.
And as the whole assembly of Israel stood there, the king turned around and blessed them all
The king turned his face, and blessed all the assembly of Israel; and all the assembly of Israel stood.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mgbe ahụ, Solomọn sịrị, “Onyenwe anyị ekwuola na ọ ga-ebi nʼoke igwe ojii.
2 Ma ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi!”
3 Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha.
4 Mgbe ahụ ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye ji aka ya abụọ mezuo nkwa ahụ o ji ọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị,
5 ‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ, maọbụ họpụta onye ọbụla ka ọ bụrụ onyendu ndị m Izrel.
6 Ma ugbu a, a họrọla m Jerusalem ka ọ bụrụ ebe Aha m ga-adị, ahọrọkwala m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’
Read 2 Chronicles 6 in the app The whole chapter