The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 5
Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ.
2 Chronicles 5:7 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 5Next →
And the priests brought in the ark of the covenant of the LORD unto his place, to the oracle of the house, into the most holy place, even under the wings of the cherubims:
Then the priests brought the ark of the covenant of the LORD to its place in the inner sanctuary of the temple, the Most Holy Place, beneath the wings of the cherubim.
The priests brought in the ark of the LORD’s covenant to its place, into the inner sanctuary of the house, to the most holy place, even under the wings of the cherubim.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
4 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị Livayị buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ.
5 Ha bugotara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ya na ụlọ nzute, na ngwongwo niile dị nsọ dị nʼime ya. Ndị nchụaja bụ ndị Livayị buliri ha elu.
6 Eze Solomọn na ọgbakọ Izrel niile, bụ ndị zukọtara nʼebe ọ nọ, nọ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na-achụ aja ọtụtụ atụrụ na ọtụtụ ehi nke a na-apụghị ịgụta ọnụ maọbụ gbakọta ọnụọgụgụ ha nʼihi ịba ụba.
7 Ndị nchụaja bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼime Ebe Kachasị Nsọ, dọba ya nʼokpuru nku cherubim ahụ.
8 Cherubim ndị ahụ gbasara nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, kpuchie ya na okporo osisi ndị ahụ e ji ebu ya.
9 Okporo osisi ndị a dị oke ogologo, na isi ha sitere nʼigbe ọgbụgba ndụ ahụ na-apụta, na e nwere ike ị site nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ hụ ha anya, ma onye na-anọghị nʼEbe Nsọ ahụ adịghị ahụ ha. Ha ka dịkwa nʼebe ahụ ruo taa
10 O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta.
Read 2 Chronicles 5 in the app The whole chapter