The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 36
Emesịa, nʼafọ nke ọzọ ya, Nebukadneza ziri ozi mee ka akpọrọ ya, na ọtụtụ ihe ndị dị oke ọnụahịa sitere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bulaa ha Babilọn nʼoge a. O mere nwanne nna Jehoiakin bụ Zedekaya, eze Juda na Jerusalem.
2 Chronicles 36:10 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 36Next →
And when the year was expired, king Nebuchadnezzar sent, and brought him to Babylon, with the goodly vessels of the house of the LORD, and made Zedekiah his brother king over Judah and Jerusalem.
In the spring, King Nebuchadnezzar summoned Jehoiachin and brought him to Babylon, along with the articles of value from the house of the LORD. And he made Jehoiachin’s relative Zedekiah king over Judah and Jerusalem.
At the return of the year, King Nebuchadnezzar sent and brought him to Babylon, with the valuable vessels of the LORD’s house, and made Zedekiah his brother king over Judah and Jerusalem.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
7 Nebukadneza bukọkwaara efere na iko ọlaedo dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, buru ha gaa buba ha nʼụlọeze ya dị na Babilọn.
8 Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim, na banyere ihe arụ niile o mere, na ihe niile a chọpụtara megide ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
9 Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị naanị ọnwa atọ na abalị iri na Jerusalem. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị.
10 Emesịa, nʼafọ nke ọzọ ya, Nebukadneza ziri ozi mee ka akpọrọ ya, na ọtụtụ ihe ndị dị oke ọnụahịa sitere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bulaa ha Babilọn nʼoge a. O mere nwanne nna Jehoiakin bụ Zedekaya, eze Juda na Jerusalem.
11 Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na otu na Jerusalem.
12 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke ya, o wedaghị onwe ya ala nara ndụmọdụ Jeremaya bụ onye amụma, onye na-ekwu okwu nke Onyenwe anyị.
13 Ọzọkwa, o nupuru isi megide eze Nebukadneza, onye mere ka ọ ṅụọ iyi nʼaha Chineke. Ọ ghọrọ onye isiike, onye mechiri obi ya, jụ ichigharịkwute Onyenwe anyị, Chineke Izrel.
Read 2 Chronicles 36 in the app The whole chapter