The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 33
O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya, sị, “Aha m ga-adịgide na Jerusalem ruo mgbe ebighị ebi.”
2 Chronicles 33:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 33Next →
Also he built altars in the house of the LORD, whereof the LORD had said, In Jerusalem shall my name be for ever.
Manasseh also built altars in the house of the LORD, of which the LORD had said, “My Name will remain in Jerusalem forever.”
He built altars in the LORD’s house, of which the LORD said, “My name shall be in Jerusalem forever.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Manase gbara afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ ise na ise na Jerusalem.
2 O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, site nʼịgbaso ihe arụ niile nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na mbụ mere, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ nʼihu ndị Izrel.
3 O wugharịrị ebe dị elu niile nke nna ya Hezekaya kwadara, o wukwara ebe ịchụ aja dị iche iche nke Baal, pịakwa ogidi Ashera dị iche iche. Ọ kpọrọ isiala nye usuu ihe niile nke dị na mbara eluigwe feekwa ha ofufe.
4 O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya, sị, “Aha m ga-adịgide na Jerusalem ruo mgbe ebighị ebi.”
5 O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe nʼogige abụọ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
6 O jikwa ụmụ ya chụọ aja nʼime ọkụ na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ọ gbara aja, taa amụsụ, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo iwe ya.
7 O were oyiyi apịrị apị nke o mere debe nʼime ụlọnsọ Chineke, nke Chineke gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi.
Read 2 Chronicles 33 in the app The whole chapter