The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 33

2 Chronicles 33:17

Ma ụfọdụ ndị Juda nọgidekwara na-achụ aja nʼugwu, maọbụ naanị Onyenwe anyị Chineke ha ka ha na-achụrụ aja ndị a.

2 Chronicles 33:17 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Chronicles 33Next →

2 Chronicles 33:17 in other translations

KJV King James Version

Nevertheless the people did sacrifice still in the high places, yet unto the LORD their God only.

BSB Berean Standard Bible

Nevertheless, the people still sacrificed at the high places, but only to the LORD their God.

WEB World English Bible

Nevertheless the people still sacrificed in the high places, but only to the LORD their God.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

14 Ọ bụ nʼoge a ka o wughachiri mgbidi nke abụọ gburugburu obodo Devid, na mgbidi dị nʼọdịda anyanwụ iyi Gaihọn na ndagwurugwu Kidrọn. Site nʼebe ahụ, o wuru ya ruo nʼọnụ ụzọ ama Azụ, na gburugburu ugwu Ofel ebe o wuliri ya elu. O dokwara ndịisi agha ya nʼobodo niile e wusiri ike dị na Juda.

15 O wezugara chi ndị mba ọzọ niile, wepụkwa oyiyi ahụ o tinyere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kụtuokwa ụlọ arụsị o wuru nʼugwu ụlọnsọ, na ndị nke o wuru na Jerusalem. O sitere nʼobodo bufuo ha.

16 Emesịa, o wugharịrị ebe ịchụ aja Onyenwe anyị dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, chụọ aja udo na aja ekele nʼelu ya. O nyekwara ndị Juda niile iwu sị ha fee Onyenwe anyị Chineke nke Izrel ofufe.

17 Ma ụfọdụ ndị Juda nọgidekwara na-achụ aja nʼugwu, maọbụ naanị Onyenwe anyị Chineke ha ka ha na-achụrụ aja ndị a.

18 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ekpere nke o kpeere Chineke ya, na okwu niile ndị ọhụ gwara ya nʼaha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Izrel niile.

19 Ekpere ya, na ọsịsa Chineke zara ya, na mmehie ya niile, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya, na ebe niile o wuru ụlọ arụsị nʼelu ugwu, na ebe ọ manyere ogidi arụsị Ashera, na arụsị ndị ọzọ, tupu o weda onwe ya ala, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị amụma.

20 Manase sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼụlọeze ya. Amọn, ọkpara ya, nọchiri ya.

Read 2 Chronicles 33 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV