The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 32
Ihe nọnyere ya bụ ogwe aka nke anụ ahụ, ma nke nọnyere anyị bụ Onyenwe anyị, Chineke anyị, inyere anyị aka na ibu agha anyị niile.” Okwu a, nke Hezekaya bụ eze Juda kwuru, mere ka ndị Juda nwee agbamume.
2 Chronicles 32:8 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 32Next →
With him is an arm of flesh; but with us is the LORD our God to help us, and to fight our battles. And the people rested themselves upon the words of Hezekiah king of Judah.
With him is only the arm of flesh, but with us is the LORD our God to help us and to fight our battles.” So the people were strengthened by the words of Hezekiah king of Judah.
An arm of flesh is with him, but the LORD our God is with us to help us and to fight our battles.” The people rested themselves on the words of Hezekiah king of Judah.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
5 Hezekaya wuzikwara mgbidi obodo ahụ, wusie ha ike nʼebe niile ọ na-ada ada. O wukwara mgbidi ọzọ gburugburu mgbidi nke ochie ahụ. O wusikwara ebe siri ike nke Milo dị nʼobodo Devid ike, kpụọkwa ọtụtụ ngwa agha na ọta.
6 O tinyere ndị agha niile nọ nʼobodo ahụ nʼokpuru ndịisi agha na-achị ha, mee ka ha niile zukọta nʼọnụ ụzọ ama nke obodo. Nʼebe ahụ ka ọ nọ gwa ha okwu sị ha,
7 “Dịrịnụ ike, unu adakwala mba. Unu atụla ụjọ maọbụ daa mba nʼihi eze Asịrịa na usuu ndị agha ya, nʼihi na onye dịnyeere anyị ka ya ike.
8 Ihe nọnyere ya bụ ogwe aka nke anụ ahụ, ma nke nọnyere anyị bụ Onyenwe anyị, Chineke anyị, inyere anyị aka na ibu agha anyị niile.” Okwu a, nke Hezekaya bụ eze Juda kwuru, mere ka ndị Juda nwee agbamume.
9 Mgbe e mesiri, mgbe Senakerib eze Asịrịa na ndị agha ya niile nọchibidoro Lakish, o zipụrụ ndị ọrụ ya gaa Jerusalem, ka ha jiri ozi a gaa maka Hezekaya, bụ eze Juda na ndị Juda niile ndị nọ nʼebe ahụ:
10 “Nke a bụ ihe Senakerib, bụ eze Asịrịa sịrị: Ọ bụ na gịnị ka ntụkwasị obi gị dabere, mere i ji nọgidesie ike na Jerusalem nʼọnọdụ nnọchibido a?
11 Mgbe Hezekaya na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị ga-azọpụta anyị site nʼaka eze Asịrịa,’ ọ bụ aghụghọ ka ọ na-aghọ unu. Ọ na-eduhie unu, na-achọ ka unu nwụọ nʼagụụ nakwa akpịrị ịkpọ nkụ.
Read 2 Chronicles 32 in the app The whole chapter