The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 32

2 Chronicles 32:17

Emesịa, Senakerib dekwara akwụkwọ mkparị ndị ọzọ, nke ọ nọ nʼime ya kwuluo Onyenwe anyị Chineke Izrel, na-asị, “Dịka chi ndị ala ọzọ niile enweghị ike zọpụta ndị ha site nʼaka m, otu a kwa, Chineke nke Hezekaya apụghịkwa ịzọpụta ndị ya site nʼaka m.”

2 Chronicles 32:17 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Chronicles 32Next →

2 Chronicles 32:17 in other translations

KJV King James Version

He wrote also letters to rail on the LORD God of Israel, and to speak against him, saying, As the gods of the nations of other lands have not delivered their people out of mine hand, so shall not the God of Hezekiah deliver his people out of mine hand.

BSB Berean Standard Bible

He also wrote letters mocking the LORD, the God of Israel, and saying against Him: “Just as the gods of the nations did not deliver their people from my hand, so the God of Hezekiah will not deliver His people from my hand.”

WEB World English Bible

He also wrote letters insulting the LORD, the God of Israel, and speaking against him, saying, “As the gods of the nations of the lands, which have not delivered their people out of my hand, so shall the God of Hezekiah not deliver his people out of my hand.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

14 Ọ bụ onye nʼetiti chi niile nke mba ndị a niile, bụ ndị nna nna m ha bibiri, napụtarala ndị ya site nʼaka m? Aṅaa ka chi unu ga-esi zọpụta unu site nʼaka m?

15 Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu, rafuokwa unu otu a. Unu ekwenyekwarala ya, nʼihi na ọ dịghị chi ọbụla maọbụ nke mba ọbụla maọbụ alaeze ọbụla pụrụ ịnapụta ndị ya site nʼaka m maọbụ nʼaka nna m ha. Ka ọ bụrụzie chi unu ga-abụ nke ga-anapụta unu site nʼaka m!”

16 Nʼụzọ dị otu a ka ndị ozi Senakerib ahụ ji leda Onyenwe anyị Chineke, na Hezekaya anya kwuokwa okwu mkparị megide ha.

17 Emesịa, Senakerib dekwara akwụkwọ mkparị ndị ọzọ, nke ọ nọ nʼime ya kwuluo Onyenwe anyị Chineke Izrel, na-asị, “Dịka chi ndị ala ọzọ niile enweghị ike zọpụta ndị ha site nʼaka m, otu a kwa, Chineke nke Hezekaya apụghịkwa ịzọpụta ndị ya site nʼaka m.”

18 Mgbe ahụ, ha ji oke olu kpọkuo ndị Jerusalem, bụ ndị nọ na mgbidi ahụ nʼasụsụ Hibru, imenye ha egwu nakwa ime ka ụjọ tụọ ha, ka ha nwee ike were obodo ahụ.

19 Ha kwuru okwu ọjọọ dị iche iche banyere Chineke nke Jerusalem, dịka ha si kwuo megide chi niile nke ndị ọzọ dị nʼụwa, bụ ọrụ aka mmadụ.

20 Mgbe ahụ, Hezekaya bụ eze, na Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, kpọkuru Chineke nke eluigwe nʼekpere.

Read 2 Chronicles 32 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV