The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 29
E gburu nna anyị ha nʼagha, dọtakwa ndị nwunye anyị na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị nʼagha nʼihi ya.
2 Chronicles 29:9 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 29Next →
For, lo, our fathers have fallen by the sword, and our sons and our daughters and our wives are in captivity for this.
For behold, this is why our fathers have fallen by the sword, and our sons and daughters and wives are in captivity.
For behold, our fathers have fallen by the sword, and our sons and our daughters and our wives are in captivity for this.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
6 Nʼihi na nna anyị ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi; ha mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, hapụ ya. Ha wepụrụ ihu ha site nʼebe obibi Onyenwe anyị, gbakụtakwa ya azụ.
7 Ha mechikwara ụzọ ndị e si abanye na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, menyụọkwa ọkụ dị nʼime ya. E sureekwaghị ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ọ dịkwaghị aja nsure ọkụ ọbụla a chụrụ nye Chineke nke Izrel.
8 Nʼihi nke a ka iwe Onyenwe anyị ji dakwasị Juda na Jerusalem. O meela ka ha buru ihe oke egwu, na oke ihere na oke ụjọ, dịka unu jirila anya unu hụ.
9 E gburu nna anyị ha nʼagha, dọtakwa ndị nwunye anyị na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa anyị nʼagha nʼihi ya.
10 Ma ugbu a, achọrọ m ka anyị na Onyenwe anyị Chineke nke Izrel gbaa ndụ, ka iwe ya jụrụ nʼebe anyị nọ.
11 Ụmụ m, o kwesighị ka unu gbakụta ọrụ unu azụ ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara unu iguzo nʼihu ya, na ijere ya ozi, na ịrụ ọrụ nʼihu ya, na ịchụrụ ya aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.”
12 Nʼoge a ndị Livayị ndị a malitere ọrụ: site nʼikwu Kohat: Mahat na Amasai, na Juel nwa Azaraya; nʼikwu Merari: Kish nwa Abdi, na Azaraya nwa Jehalelel; nʼikwu Geshọn: Joa nwa Zima, na Eden nwa Joa;
Read 2 Chronicles 29 in the app The whole chapter