The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 28
Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.
2 Chronicles 28:22 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 28Next →
And in the time of his distress did he trespass yet more against the LORD: this is that king Ahaz.
In the time of his distress, King Ahaz became even more unfaithful to the LORD.
In the time of his distress, he trespassed yet more against the LORD, this same King Ahaz.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
19 Ma Onyenwe anyị wedara Juda nʼala nʼihi Ehaz, eze Izrel onye mere ka ihe ọjọọ baa ụba na Juda, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya nye Onyenwe anyị.
20 Mgbe Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa bịara, o wetaara Ehaz nsogbu kama enyemaka.
21 Ehaz weere ụfọdụ ihe dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, sitekwa na nʼụlọ ndịisi obodo, were ha nye eze Asịrịa, ma ihe ndị a enyereghị ya aka.
22 Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.
23 Ọ chụrụ aja nye chi niile nke Damaskọs, bụ ndị meriri ya nʼagha. Ọ sịrị, “Nʼihi na chi nke ndị eze Aram nyeere ha aka, ha ka m ga-achụrụ aja, ka ha nwee ike nyere m aka.” Ma ha bụ ihe wetaara ya ọdịda, bụrụkwa ọdịda nye Izrel niile.
24 Ehaz chịkọtara ngwongwo niile dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, gbujasịa ha. O mechiri ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ma wuo ọtụtụ ebe ịchụ aja na nkuku ụzọ niile nʼime Jerusalem.
25 Nʼobodo niile ọbụla na Juda, o wuru ebe dị elu maka ịchụ aja dị iche iche nye chi ndị ọzọ, si otu a kpasuo Onyenwe anyị, bụ Chineke nna nna ya ha iwe.
Read 2 Chronicles 28 in the app The whole chapter