The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 24
Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
2 Chronicles 24:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 24Next →
And they conspired against him, and stoned him with stones at the commandment of the king in the court of the house of the LORD.
But they conspired against Zechariah, and by order of the king, they stoned him in the courtyard of the house of the LORD.
They conspired against him, and stoned him with stones at the commandment of the king in the court of the LORD’s house.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Ha hapụrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna ha, fee ogidi Ashera na arụsị ndị ọzọ. Nʼihi ikpe ọmụma ha wetaara onwe ha, iwe Chineke dakwasịrị Juda na Jerusalem.
19 Onyenwe anyị zitere ọtụtụ ndị amụma, ndị bịara buo amụma maka ịkpọghachi ha azụ, ma ha mesiri obi ha ike, jụ ige ntị.
20 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’ ”
21 Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
22 Eze Joash echetaghị ebere nke nna Zekaraya bụ Jehoiada meere ya kama o gburu nwa ya. Ma mgbe ọ na-anwụ, ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị hụkwa mmeso ọjọọ a ma kwụọkwa unu ụgwọ ajọ omume unu niile.”
23 O ruo ka ọ gbara otu afọ, ndị agha Aram bịara imegide Joash, ha wakporo Juda na Jerusalem gbuo ndị ndu niile site nʼetiti ndị mmadụ. Ha zigaara eze ha nọ na Damaskọs ihe niile ha kwatara nʼike.
24 Nʼagbanyeghị na ndị Aram kpọọ naanị ndị ikom ole na ole bịa, Onyenwe anyị raara igwe ndị agha dị ukwuu ranye ha nʼaka. Nʼihi na Juda gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke nke nna nna ha, e mezuru ihe niile e kpere nʼikpe nʼahụ Joash.
Read 2 Chronicles 24 in the app The whole chapter